Friday, December 20, 2013

IHE KPATARA AZU MBE JI WERE DI NKERI-NKERI BY CHISOLU

n'oge ochie,umu anumanu na chukwu bu enyi,ha na asopurukwa ya nke
ukuu,n'ebujere ya nri n'ubosi eke niile...n'otu oge,aguu wee guo
umu-anumanu nke ukuu nke kpatara n'ha ebujeghizi chukwu nri,chukwu
were kpoo umu anumanu niile nzuko n'eluigwe..n'ihi n'mbe enweghi
nku,onweghi ike isoro ya were gaa,owutere umu-anumanu ndi n'efe-efe,ha
were nyebinye ja nku,ka owere wee soro ha gaa,ka ha ruru
n'eluigwe,ogwara ha si "onye obula choo aha oga aza" nduru(dove) siri
na ya bu ada-eze,agu-nkwo(wren) siri na ya bu agu n' efe-efe,ha niile
werechere aha di iche-iche,mbe were si na aha ya bu "unu-niile"
..n'otu ntabi anya ,mmuo ozi(angels) butere ha nri ,mbe juru ya si
"kedu onye nwe nri a niile" o zara ya si "unu-niile" mbe wee chetere
umu anumanu maka aha ha dum,n'otu ntabi anya,o richapuru nri niile
dum...n'oke iwe umu-anumanu n'efe-efe were napu ya nku ha nyere
ya...ka orijuru afo,oziri nduru(dove) ka ogwa nwa ya ka obuputa akwa
ya(bed) k' osi n' eluigwe daa n'elu ya,nduru(dove) gwara nwa mbe
si.."Bupute ihe niile eji eje agha,nna gi n'akwado ogu,ka obuputechara
ha niile,mbe were siri n'elu daa na ya were meruo aru nke ukuu,mana
ejula(snail) mere ya ebere were aso-mmiri(saliva) were mechie ya
okpokoro ya mebiri emebi,o bu ya kpatara n'azu mbe di nkeri-nkeri rue
taa.

3 comments:

  1. Hahaha. Mbe papa uche. Umu anumanu amaro na mbe nwere ihe ndi oyibo na akpo 'PHD' na aruruani.

    ReplyDelete
  2. Chakpiii........woo!

    ReplyDelete
  3. mbe nwoke akpa uche(brain box).

    ReplyDelete

Comment(s) expressed on this blog belong(s) to the individual(s) making them(it) and it is in no way related to UnizikSugNews or Martin Beck Nworah. For articles or news submission, events coverage, birthdays and adverts on the OFFICIAL S.U.G blog; call 08144322744 OR ziksugnews@gmail.com